Job 32

Okwu Elihu

1Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume. 2Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke. 3Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe. 4Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ. 5Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.

6Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:

“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,
ma unu bụ ndị okenye;
ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,
hapụ ịgwa unu ihe m maara.
7Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;
ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’
8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,
ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.

10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;
mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
11Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,
egere m ntị na ntụgharị uche unu,
oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
12Egere m nnọọ unu ntị,
ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;
ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
13Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;
ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
14Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,
ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.

15“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;
ike okwu agwụla ha.
16M ga-echere, ugbu a ha deere duu,
ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
17Mụ onwe m ga-ekwu uche m;
ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,
18nʼihi na okwu juru m ọnụ,
ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.
19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,
dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
20Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;
aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.
21Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide
maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
22Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,
Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.
Copyright information for IboBIU